Ọpụpụ 34:19
Exodus 34:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nwa nwoke ọbụla e bụ ụzọ mụọ bụ nke m, tinyere ụmụ anụ ụlọ, ma ehi, ma atụrụ, ma ewu.
Exodus 34:19 in English
Exodus 34:19 · Berean Standard Bible
The first offspring of every womb belongs to Me, including all the firstborn males among your livestock, whether cattle or sheep.
Context
17“Unu akpụla chi ọbụla. 18“Na-emenụ mmemme achịcha na-ekoghị eko. Rienụ achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa, dịka m nyere nʼiwu na a ga-eme nʼụbọchị ndị ahụ a họpụtara, nʼọnwa Abib, nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta. 19“Nwa nwoke ọbụla e bụ ụzọ mụọ bụ nke m, tinyere ụmụ anụ ụlọ, ma ehi, ma atụrụ, ma ewu. 20E nwere ike ịgbapụta nwa oke ịnyịnya ibu site nʼiwere nwa atụrụ dochie nʼọnọdụ ya. Ọ bụrụ na i kpebie na ị gaghị agbapụta ya, mgbe ahụ, ị ga-agbaji olu ya. Ma ụmụ unu ndị ikom niile ka a ga-agbapụta.
“O nweghị onye ọbụla nʼime unu ga-abịa guzo m nʼihu na-ejighị onyinye. 21“Nʼoge ịkụ ihe nʼubi na nʼoge owuwe ihe ubi, rụọnụ ọrụ naanị ụbọchị isii. Zukwanụ ike nʼụbọchị nke asaa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.