Native Bible

Exodus 34:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Na-emenụ mmemme achịcha na-ekoghị eko. Rienụ achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa, dịka m nyere nʼiwu na a ga-eme nʼụbọchị ndị ahụ a họpụtara, nʼọnwa Abib, nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta.

Exodus 34:18 in English

Exodus 34:18 · Berean Standard Bible

You are to keep the Feast of Unleavened Bread.* For seven days at the appointed time in the month of Abib,* you are to eat unleavened bread as I commanded you. For in the month of Abib you came out of Egypt.

Context

16Mgbe unu lụtara ụfọdụ ndị inyom ha dịka nwunye nye ụmụ unu ndị ikom, ndị inyom ndị a na-akwaso chi ha iko, ga-eme ka ụmụ unu ndị ikom soro ha nʼomume dị otu a. 17“Unu akpụla chi ọbụla. 18“Na-emenụ mmemme achịcha na-ekoghị eko. Rienụ achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa, dịka m nyere nʼiwu na a ga-eme nʼụbọchị ndị ahụ a họpụtara, nʼọnwa Abib, nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta. 19“Nwa nwoke ọbụla e bụ ụzọ mụọ bụ nke m, tinyere ụmụ anụ ụlọ, ma ehi, ma atụrụ, ma ewu. 20E nwere ike ịgbapụta nwa oke ịnyịnya ibu site nʼiwere nwa atụrụ dochie nʼọnọdụ ya. Ọ bụrụ na i kpebie na ị gaghị agbapụta ya, mgbe ahụ, ị ga-agbaji olu ya. Ma ụmụ unu ndị ikom niile ka a ga-agbapụta. “O nweghị onye ọbụla nʼime unu ga-abịa guzo m nʼihu na-ejighị onyinye.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.