Native Bible

Exodus 32:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼechi ya, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị ha, “Unu emeela mmehie dị ukwuu megide Onyenwe anyị. Ma aga m alaghachikwuru Onyenwe anyị nʼelu ugwu ahụ rịọọ ya. Ma eleghị anya, aga m arịọta maka ikpuchi mmehie unu.”

Exodus 32:30 in English

Exodus 32:30 · Berean Standard Bible

The next day Moses said to the people, “You have committed a great sin. Now I will go up to the LORD; perhaps I can make atonement for your sin.”

Context

28Ndị Livayị mezuru ihe Mosis gwara ha. Ya mere ndị nwụrụ nʼụbọchị ahụ dị puku mmadụ atọ. 29Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Livayị okwu sị, “Taa, unu ekewapụtala onwe unu nye Onyenwe anyị. Nʼihi na unu gburu ụmụ unu ndị ikom na ụmụnne unu ndị ikom. Ugbu a, ọ gọziela unu taa.” 30Nʼechi ya, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị ha, “Unu emeela mmehie dị ukwuu megide Onyenwe anyị. Ma aga m alaghachikwuru Onyenwe anyị nʼelu ugwu ahụ rịọọ ya. Ma eleghị anya, aga m arịọta maka ikpuchi mmehie unu.” 31Ya mere, Mosis jekwuuru Onyenwe anyị sị ya, “Biko Onyenwe anyị, ndị a emeela mmehie dị ukwuu megide gị, nʼihi na ha akpụọlara onwe ha chi ọlaedo. 32Ma ugbu a, biko, gbaghara mmehie ha. Ọ bụrụ na ị gaghị agbaghara ha, biko hichapụ aha m site nʼakwụkwọ ahụ i dere.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.