Ọpụpụ 32:29
Exodus 32:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Livayị okwu sị, “Taa, unu ekewapụtala onwe unu nye Onyenwe anyị. Nʼihi na unu gburu ụmụ unu ndị ikom na ụmụnne unu ndị ikom. Ugbu a, ọ gọziela unu taa.”
Exodus 32:29 in English
Exodus 32:29 · Berean Standard Bible
Afterward, Moses said, “Today you have been ordained * for service to the LORD, since each man went against his son and his brother; so the LORD has bestowed a blessing on you this day.”
Context
27Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel kwuru, ‘Nwoke ọbụla nyara mma agha ya nʼakụkụ ya,* jegharịa nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ụmụ Izrel, site nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ. Ya gbuo ọbụladị nwanne ya nwoke, maọbụ enyi ya, maọbụ onye agbataobi ya.’ ” 28Ndị Livayị mezuru ihe Mosis gwara ha. Ya mere ndị nwụrụ nʼụbọchị ahụ dị puku mmadụ atọ. 29Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Livayị okwu sị, “Taa, unu ekewapụtala onwe unu nye Onyenwe anyị. Nʼihi na unu gburu ụmụ unu ndị ikom na ụmụnne unu ndị ikom. Ugbu a, ọ gọziela unu taa.” 30Nʼechi ya, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị ha, “Unu emeela mmehie dị ukwuu megide Onyenwe anyị. Ma aga m alaghachikwuru Onyenwe anyị nʼelu ugwu ahụ rịọọ ya. Ma eleghị anya, aga m arịọta maka ikpuchi mmehie unu.” 31Ya mere, Mosis jekwuuru Onyenwe anyị sị ya, “Biko Onyenwe anyị, ndị a emeela mmehie dị ukwuu megide gị, nʼihi na ha akpụọlara onwe ha chi ọlaedo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.