Ọpụpụ 31:9
Exodus 31:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ngwongwo ya, na ite mmiri ịsa ụkwụ na aka, na ụkwụ ite ahụ.
Exodus 31:9 in English
Exodus 31:9 · Berean Standard Bible
the altar of burnt offering with all its utensils, and the basin with its stand—
Context
7“ya bụ, ụlọ nzute ahụ,
na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, na ebe mkpuchi mmehie dị ya nʼelu,
na ngwongwo ndị ọzọ niile dị nʼụlọ ikwu ahụ, 8na tebul, na ngwongwo ya,
ma ihe ịdọkwasị oriọna nke ọlaedo a nụchara anụcha,
na ngwongwo ya, 9na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ngwongwo ya,
na ite mmiri ịsa ụkwụ na aka, na ụkwụ ite ahụ. 10Na uwe ọma ahụ akpara akpa,
ma uwe nsọ Erọn onye nchụaja
na uwe nke ụmụ ya ndị ikom, mgbe ha na-eje ozi dịka ndị nchụaja. 11Ya na mmanụ nsọ ahụ, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ e mere maka Ebe Nsọ.
“Ha ga-arụzu ihe ndị a nʼusoro dịka m si nye gị ya nʼiwu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.