Native Bible

Exodus 30:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Akụkụ anọ ya ga-aha nʼotu. Ogologo ya na obosara ya ga-adị iri sentimita anọ na ise. Ịdị elu ya ga-adị iri sentimita itoolu. Mpi ya niile ga-esi na ya pụta.

Exodus 30:2 in English

Exodus 30:2 · Berean Standard Bible

It is to be square, a cubit long, a cubit wide, and two cubits high.* Its horns must be of one piece.

Context

1“Jiri osisi akashia rụọ ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. 2Akụkụ anọ ya ga-aha nʼotu. Ogologo ya na obosara ya ga-adị iri sentimita anọ na ise. Ịdị elu ya ga-adị iri sentimita itoolu. Mpi ya niile ga-esi na ya pụta. 3Jiri ọlaedo a nụchara anụcha machie elu ya, akụkụ ya niile nakwa mpi ya niile. Ị ga-ejikwa ọlaedo kpụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu. 4Kpụnye mgbaaka ọlaedo abụọ nʼokpuru ihe ahụ akpụlitere akpụlite, abụọ na ncherita ihu akụkụ ọbụla, ebe ga na-ejide mkpara e ji ebu ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.