Native Bible

Exodus 30:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Jiri bronz kpụọ efere ukwu na ihe ndọkwasị ya, maka ịsa ihe. Wụnye mmiri nʼime ya, dọsa ya nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja.

Exodus 30:18 in English

Exodus 30:18 · Berean Standard Bible

“You are to make a bronze basin with a bronze stand for washing. Set it between the Tent of Meeting and the altar, and put water in it,

Context

16Nabata ego niile ndị a site nʼaka ụmụ Izrel, ma jiri ya jee ozi dị nʼụlọ nzute. Ihe onyinye a ga-eme bụ ịkpọtụ uche Onyenwe anyị nʼebe unu nọ nʼihi mkpuchi mmehie maka ndụ unu.” 17Ọzọkwa, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 18“Jiri bronz kpụọ efere ukwu na ihe ndọkwasị ya, maka ịsa ihe. Wụnye mmiri nʼime ya, dọsa ya nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja. 19Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga na-asa ụkwụ na aka ha site na ya. 20Mgbe ọbụla ha na-aba nʼụlọ nzute ahụ, ha ga-eji mmiri saa onwe ka ha ghara ịnwụ. Ọzọkwa, mgbe ha na-abịaru nso nʼebe ịchụ aja, maka ije ozi iche onyinye nʼihu Onyenwe anyị site nʼọkụ,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.