Native Bible

Exodus 29:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Werekwa mmanụ nsọ ahụ, tee ya, site nʼịwụkwasị ya nʼisi ya.

Exodus 29:7 in English

Exodus 29:7 · Berean Standard Bible

Then take the anointing oil and anoint him by pouring it on his head.

Context

5Yikwasị Erọn uwe ime ahụ, uwe mwụda nke efọọd, efọọd ahụ na ihe mgbochi obi. Were ihe okike efọọd ahụ nke akpaziri nke ọma kegide ya efọọd ahụ nʼahụ. 6Tụhịakwa akwa ike nʼisi ahụ nʼisi ya. Tinye okpu nsọ ahụ nʼelu akwa ike nʼisi ahụ. 7Werekwa mmanụ nsọ ahụ, tee ya, site nʼịwụkwasị ya nʼisi ya. 8Kpọta ụmụ ya ndị ikom, yikwasị ha uwe ime ahụ. 9Kekwasịkwa ha ihe okike nʼisi. Keekwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom ihe ike nʼukwu. Mgbe ahụ ọrụ ndị nchụaja ga-abụ nke ha site nʼụkpụrụ ebighị ebi. “Nʼụzọ dị otu a ka ị ga-esi doo Erọn na ụmụ ya ndị ikom nsọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.