Ọpụpụ 29:42
Exodus 29:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“A ga na-achụ aja nsure ọkụ a oge niile nʼọgbọ niile, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute m ka a ga-achụ ya, nʼihu Onyenwe anyị. Nʼihi nʼebe ahụ ka m ga-ezute gị gwa gị okwu.
Exodus 29:42 in English
Exodus 29:42 · Berean Standard Bible
For the generations to come, this burnt offering shall be made regularly at the entrance to the Tent of Meeting before the LORD, where I will meet you to speak with you.
Context
40Ị ga-ewere nwa atụrụ, tinyere lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri akwọzi nke a gwọkọtara nʼotu lita mmanụ oliv asụrụ asụ, chụọ aja. Wetakwa otu lita mmanya dịka aja ihe ọṅụṅụ. 41Jirikwa nwa atụrụ nke ọzọ, ya na otu ụdị aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ ya dịka i mere nʼụtụtụ. Aja isisi ya dị ezi mma, nke e sitere nʼọkụ a na-achụ nye Onyenwe anyị. 42“A ga na-achụ aja nsure ọkụ a oge niile nʼọgbọ niile, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute m ka a ga-achụ ya, nʼihu Onyenwe anyị. Nʼihi nʼebe ahụ ka m ga-ezute gị gwa gị okwu. 43Nʼebe ahụ kwa ka m ga-ezute ndị Izrel niile. Nʼihi ya, aga m esite nʼịdị ebube m doo ebe ahụ nsọ. 44“E, aga m edo ụlọ nzute ahụ nsọ, ya na ebe ịchụ aja, na Erọn na ụmụ ya ndị ikom, ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.