Native Bible

Exodus 29:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“E, aga m edo ụlọ nzute ahụ nsọ, ya na ebe ịchụ aja, na Erọn na ụmụ ya ndị ikom, ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja.

Exodus 29:44 in English

Exodus 29:44 · Berean Standard Bible

So I will consecrate the Tent of Meeting and the altar, and I will consecrate Aaron and his sons to serve Me as priests.

Context

42“A ga na-achụ aja nsure ọkụ a oge niile nʼọgbọ niile, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute m ka a ga-achụ ya, nʼihu Onyenwe anyị. Nʼihi nʼebe ahụ ka m ga-ezute gị gwa gị okwu. 43Nʼebe ahụ kwa ka m ga-ezute ndị Izrel niile. Nʼihi ya, aga m esite nʼịdị ebube m doo ebe ahụ nsọ. 44“E, aga m edo ụlọ nzute ahụ nsọ, ya na ebe ịchụ aja, na Erọn na ụmụ ya ndị ikom, ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. 45Mgbe ahụ, aga m ebi nʼetiti ụmụ Izrel, bụrụkwa Chineke ha. 46Ha ga-amata na m bụ Onyenwe anyị Chineke ha. Onye sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha, ka m si otu a biri nʼetiti ha. Abụ m Onyenwe anyị Chineke ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.