Native Bible

Exodus 29:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Were anụ ebule ido nsọ ahụ, sienụ anụ ahụ nʼebe dị nsọ.

Exodus 29:31 in English

Exodus 29:31 · Berean Standard Bible

You are to take the ram of ordination and boil its flesh in a holy place.

Context

29“Uwe nsọ Erọn ndị a niile ka a ga-edebe nʼihi mmemme ido nsọ. A ga-eji ha na-edo ụmụ ya nsọ bụ ndị ga-anọchi anya ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 30Nwa ya nwoke ọbụla nke nọchiri anya ya dịka onye nchụaja, nke bịara nʼụlọ nzute m ije ozi nʼEbe Nsọ ga-eyi uwe ndị a ụbọchị asaa. 31“Were anụ ebule ido nsọ ahụ, sienụ anụ ahụ nʼebe dị nsọ. 32Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri anụ ebule ahụ, na achịcha ndị ahụ dị nʼime nkata nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. 33Ha ga-eri ihe ndị aja niile ahụ nke e ji chụọ aja mkpuchi mmehie, nʼoge ido nsọ ha. Ọ dịghị onye ọbụla ọzọ ga-eso ha rie ya, nʼihi na ha bụ ihe dị nsọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.