Ọpụpụ 29:30
Exodus 29:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nwa ya nwoke ọbụla nke nọchiri anya ya dịka onye nchụaja, nke bịara nʼụlọ nzute m ije ozi nʼEbe Nsọ ga-eyi uwe ndị a ụbọchị asaa.
Exodus 29:30 in English
Exodus 29:30 · Berean Standard Bible
The son who succeeds him as priest and enters the Tent of Meeting to minister in the Holy Place must wear them for seven days.
Context
28Nke a ga-abụ oke Erọn na ụmụ ụmụ ya ga-eketa dịka ụkpụrụ mgbe ebighị ebi nʼaka ndị Izrel. Mgbe niile ọbụla ha na-achụ aja udo maọbụ aja ekele, ka nke a bụrụ onyinye ụmụ Izrel na-enye Onyenwe anyị site nʼaja ha. 29“Uwe nsọ Erọn ndị a niile ka a ga-edebe nʼihi mmemme ido nsọ. A ga-eji ha na-edo ụmụ ya nsọ bụ ndị ga-anọchi anya ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 30Nwa ya nwoke ọbụla nke nọchiri anya ya dịka onye nchụaja, nke bịara nʼụlọ nzute m ije ozi nʼEbe Nsọ ga-eyi uwe ndị a ụbọchị asaa. 31“Were anụ ebule ido nsọ ahụ, sienụ anụ ahụ nʼebe dị nsọ. 32Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri anụ ebule ahụ, na achịcha ndị ahụ dị nʼime nkata nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.