Native Bible

Exodus 29:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ị ga-etinye achịcha ndị a niile nʼime otu nkata, bute ha nʼime nkata ahụ, wetakwa nwa oke ehi, na ebule abụọ.

Exodus 29:3 in English

Exodus 29:3 · Berean Standard Bible

put them in a basket, and present them in the basket, along with the bull and the two rams.

Context

1“Nke a ga-abụ usoro mmemme nke ị ga-eme, iji doo Erọn na ụmụ ya ndị ikom nsọ, ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. Were nwa oke ehi na ebule abụọ nke na-enweghị ntụpọ ọbụla. 2Werekwa ọka wiiti a kwọrọ nke ọma, mee achịcha nke na-enweghị ihe na-eko achịcha e tinyere nʼime ha, achịcha mbadamba na-ekoghị eko nke e ji mmanụ oliv gwakọtaa, ya na achịcha mbadamba ọzọ dị nta na-ekoghị eko nke e tere mmanụ nʼahụ ya. 3Mgbe ahụ, ị ga-etinye achịcha ndị a niile nʼime otu nkata, bute ha nʼime nkata ahụ, wetakwa nwa oke ehi, na ebule abụọ. 4Kpọpụta Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, jiri mmiri saa ha ahụ. 5Yikwasị Erọn uwe ime ahụ, uwe mwụda nke efọọd, efọọd ahụ na ihe mgbochi obi. Were ihe okike efọọd ahụ nke akpaziri nke ọma kegide ya efọọd ahụ nʼahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.