Native Bible

Exodus 29:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Kpọpụta Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, jiri mmiri saa ha ahụ.

Exodus 29:4 in English

Exodus 29:4 · Berean Standard Bible

Then present Aaron and his sons at the entrance to the Tent of Meeting and wash them with water.

Context

2Werekwa ọka wiiti a kwọrọ nke ọma, mee achịcha nke na-enweghị ihe na-eko achịcha e tinyere nʼime ha, achịcha mbadamba na-ekoghị eko nke e ji mmanụ oliv gwakọtaa, ya na achịcha mbadamba ọzọ dị nta na-ekoghị eko nke e tere mmanụ nʼahụ ya. 3Mgbe ahụ, ị ga-etinye achịcha ndị a niile nʼime otu nkata, bute ha nʼime nkata ahụ, wetakwa nwa oke ehi, na ebule abụọ. 4Kpọpụta Erọn na ụmụ ya ndị ikom nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, jiri mmiri saa ha ahụ. 5Yikwasị Erọn uwe ime ahụ, uwe mwụda nke efọọd, efọọd ahụ na ihe mgbochi obi. Were ihe okike efọọd ahụ nke akpaziri nke ọma kegide ya efọọd ahụ nʼahụ. 6Tụhịakwa akwa ike nʼisi ahụ nʼisi ya. Tinye okpu nsọ ahụ nʼelu akwa ike nʼisi ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.