Ọpụpụ 29:16
Exodus 29:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gbuo ya. Werekwa ọbara ya fesaa nʼakụkụ ya niile nke ebe ịchụ aja.
Exodus 29:16 in English
Exodus 29:16 · Berean Standard Bible
You are to slaughter the ram, take its blood, and sprinkle it on all sides of the altar.
Context
14Ma anụ oke ehi ahụ, akpụkpọ ya na mgbịrị afọ ya, ka ị ga-akpọ ọkụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ọ bụ aja mmehie. 15“Were otu nʼime ebule ndị ahụ, ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasị aka ha nʼelu isi ya. 16Gbuo ya. Werekwa ọbara ya fesaa nʼakụkụ ya niile nke ebe ịchụ aja. 17Bọwasịa ebule ahụ ntakịrị ntakịrị, sachaa eriri afọ ya na ihe dị ya nʼime, ha na ụkwụ ya niile, tinyekọ ha na isi ya na akụkụ anụ ndị ọzọ. 18Kpọọ ebule ahụ niile ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ bụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nke isisi ya dị ezi mma. Aja a chụrụ nye Onyenwe anyị site nʼọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.