Ọpụpụ 29:17
Exodus 29:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Bọwasịa ebule ahụ ntakịrị ntakịrị, sachaa eriri afọ ya na ihe dị ya nʼime, ha na ụkwụ ya niile, tinyekọ ha na isi ya na akụkụ anụ ndị ọzọ.
Exodus 29:17 in English
Exodus 29:17 · Berean Standard Bible
Cut the ram into pieces, wash the entrails and legs, and place them with its head and other pieces.
Context
15“Were otu nʼime ebule ndị ahụ, ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasị aka ha nʼelu isi ya. 16Gbuo ya. Werekwa ọbara ya fesaa nʼakụkụ ya niile nke ebe ịchụ aja. 17Bọwasịa ebule ahụ ntakịrị ntakịrị, sachaa eriri afọ ya na ihe dị ya nʼime, ha na ụkwụ ya niile, tinyekọ ha na isi ya na akụkụ anụ ndị ọzọ. 18Kpọọ ebule ahụ niile ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ bụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nke isisi ya dị ezi mma. Aja a chụrụ nye Onyenwe anyị site nʼọkụ. 19“Were ebule nke ọzọ, ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-ebikwasị aka ha nʼelu isi ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.