Ọpụpụ 29:14
Exodus 29:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma anụ oke ehi ahụ, akpụkpọ ya na mgbịrị afọ ya, ka ị ga-akpọ ọkụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ọ bụ aja mmehie.
Exodus 29:14 in English
Exodus 29:14 · Berean Standard Bible
But burn the flesh of the bull and its hide and dung outside the camp; it is a sin offering.*
Context
12Jiri mkpịsịaka gị rụta ụfọdụ nʼime ọbara oke ehi ahụ tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja ahụ. Wụpụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja. 13Were abụba niile kpuchiri ihe ime ya, mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ ya na abụba dị nʼelu ha, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. 14Ma anụ oke ehi ahụ, akpụkpọ ya na mgbịrị afọ ya, ka ị ga-akpọ ọkụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ọ bụ aja mmehie. 15“Were otu nʼime ebule ndị ahụ, ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasị aka ha nʼelu isi ya. 16Gbuo ya. Werekwa ọbara ya fesaa nʼakụkụ ya niile nke ebe ịchụ aja.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.