Native Bible

Exodus 29:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Were abụba niile kpuchiri ihe ime ya, mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ ya na abụba dị nʼelu ha, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja.

Exodus 29:13 in English

Exodus 29:13 · Berean Standard Bible

Take all the fat that covers the entrails and the lobe of the liver, and both kidneys with the fat on them, and burn them on the altar.

Context

11Gbuo ya nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 12Jiri mkpịsịaka gị rụta ụfọdụ nʼime ọbara oke ehi ahụ tee ya na mpi dị nʼebe ịchụ aja ahụ. Wụpụ ọbara fọdụrụ nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja. 13Were abụba niile kpuchiri ihe ime ya, mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ ya na abụba dị nʼelu ha, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. 14Ma anụ oke ehi ahụ, akpụkpọ ya na mgbịrị afọ ya, ka ị ga-akpọ ọkụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ọ bụ aja mmehie. 15“Were otu nʼime ebule ndị ahụ, ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasị aka ha nʼelu isi ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.