Native Bible

Exodus 26:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Meekwa akwa mgbochi nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.

Exodus 26:31 in English

Exodus 26:31 · Berean Standard Bible

Make a veil of blue, purple, and scarlet yarn, and finely spun linen, with cherubim skillfully worked into it.

Context

29Jiri ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile, kpụọ mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta osisi ntụbichi ndị a. Jirikwa ọlaedo machie osisi ntụbichi ndị a. 30“Guzobe ụlọ nzute a nʼusoro dịka ụdịdị ihe ahụ m ziri gị nʼelu ugwu si dị. 31“Meekwa akwa mgbochi nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya. 32Were anya nko ọlaedo kwụba ya nʼelu ogidi osisi akashia anọ nke e ji ọlaedo machie, mee ka o guzoro nʼelu ụkwụ ọlaọcha anọ. 33Konye akwa mgbochi ahụ na nko ndị ahụ, ma dọnye igbe ihe ama ahụ nʼazụ akwa mgbochi ahụ. Akwa mgbochi ahụ ga-ekewapụ Ebe Nsọ ahụ site nʼEbe Kachasị Nsọ.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.