Ọpụpụ 26:29
Exodus 26:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jiri ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile, kpụọ mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta osisi ntụbichi ndị a. Jirikwa ọlaedo machie osisi ntụbichi ndị a.
Exodus 26:29 in English
Exodus 26:29 · Berean Standard Bible
Overlay the frames with gold and make gold rings to hold the crossbars. Also overlay the crossbars with gold.
Context
27ise nke ọzọ maka ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ, ise nke ọzọ maka mbudo ibo dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼebe ndịda ndịda nke ụlọ nzute ahụ. 28Osisi ntụbichi nke dị nʼetiti ga-esite nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ nke mbudo ibo ahụ. 29Jiri ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile, kpụọ mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta osisi ntụbichi ndị a. Jirikwa ọlaedo machie osisi ntụbichi ndị a. 30“Guzobe ụlọ nzute a nʼusoro dịka ụdịdị ihe ahụ m ziri gị nʼelu ugwu si dị. 31“Meekwa akwa mgbochi nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.