Ọpụpụ 25:31
Exodus 25:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Kpụọ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mee ka iko ya niile yiri okoko osisi, na isi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya.
Exodus 25:31 in English
Exodus 25:31 · Berean Standard Bible
Then you are to make a lampstand of pure, hammered gold. It shall be made of one piece, including its base and shaft, its cups, and its buds and petals.
Context
29Ọzọkwa, jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ efere dị iche iche, na iko dị iche iche, na ọkwa dị iche iche, nke e ji awụpụ onyinye. 30Dọkwasị achịcha nke iche nʼIhu nʼelu tebul ahụ, nʼihu m, oge niile. 31“Jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Kpụọ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mee ka iko ya niile yiri okoko osisi, na isi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya. 32Alaka isii ga-esite nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ. 33Iko atọ e mere dịka okoko osisi alụmọnd ya na ifuru, ya na okoko ya niile ga-adị nʼotu alaka, iko atọ nʼalaka nke ọzọ, otu a ka ọ ga-adị nʼalaka isii niile ahụ na-awapụta site nʼihe ịdọkwasị oriọna ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.