Ọpụpụ 25:32
Exodus 25:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Alaka isii ga-esite nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ.
Exodus 25:32 in English
Exodus 25:32 · Berean Standard Bible
Six branches are to extend from the sides of the lampstand—three on one side and three on the other.
Context
30Dọkwasị achịcha nke iche nʼIhu nʼelu tebul ahụ, nʼihu m, oge niile. 31“Jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Kpụọ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mee ka iko ya niile yiri okoko osisi, na isi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya. 32Alaka isii ga-esite nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ. 33Iko atọ e mere dịka okoko osisi alụmọnd ya na ifuru, ya na okoko ya niile ga-adị nʼotu alaka, iko atọ nʼalaka nke ọzọ, otu a ka ọ ga-adị nʼalaka isii niile ahụ na-awapụta site nʼihe ịdọkwasị oriọna ahụ. 34Nʼelu ihe ịdọba oriọna ahụ, ọ ga-adị iko anọ dịka ifuru osisi alụmọnd, ya na ebe o si awapụta na okoko ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.