Ọpụpụ 25:24
Exodus 25:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha machie ya nke ọma, jirikwa ọlaedo kpụọ ọnụ ọnụ ya gburugburu.
Exodus 25:24 in English
Exodus 25:24 · Berean Standard Bible
Overlay it with pure gold and make a gold molding around it.
Context
22Nʼebe ahụ, nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ dị nʼelu ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ, ka m ga-ezute gị, nye gị iwu niile ị ga-enye ndị Izrel. 23“Jiri osisi akashia mee tebul nke ogologo ya ga-adị iri sentimita itoolu. Obosara ya ga-abụ iri sentimita anọ na ise. Ịla elu ya ga-abụ iri sentimita isii na asaa. 24Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha machie ya nke ọma, jirikwa ọlaedo kpụọ ọnụ ọnụ ya gburugburu. 25Ị ga-etinye ihe njikọta a kpụrụ akpụ gburugburu ọnụ ọnụ ya, nke ga-aha ka otu ọbụ aka* dimkpa. A ga-eji mpempe ọlaedo techie ihe njikọta ahụ gburugburu. 26Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ, kwụnye ha nʼakụkụ anọ ahụ nke ụkwụ anọ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.