Native Bible

Exodus 25:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Jiri osisi akashia mee tebul nke ogologo ya ga-adị iri sentimita itoolu. Obosara ya ga-abụ iri sentimita anọ na ise. Ịla elu ya ga-abụ iri sentimita isii na asaa.

Exodus 25:23 in English

Exodus 25:23 · Berean Standard Bible

You are also to make a table of acacia wood two cubits long, a cubit wide, and a cubit and a half high.*

Context

21Tụkwasị ihe mkpuchi ahụ nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Tinyekwa Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime igbe ahụ. 22Nʼebe ahụ, nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ dị nʼelu ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ, ka m ga-ezute gị, nye gị iwu niile ị ga-enye ndị Izrel. 23“Jiri osisi akashia mee tebul nke ogologo ya ga-adị iri sentimita itoolu. Obosara ya ga-abụ iri sentimita anọ na ise. Ịla elu ya ga-abụ iri sentimita isii na asaa. 24Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha machie ya nke ọma, jirikwa ọlaedo kpụọ ọnụ ọnụ ya gburugburu. 25Ị ga-etinye ihe njikọta a kpụrụ akpụ gburugburu ọnụ ọnụ ya, nke ga-aha ka otu ọbụ aka* dimkpa. A ga-eji mpempe ọlaedo techie ihe njikọta ahụ gburugburu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.