Ọpụpụ 25:12
Exodus 25:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnye ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya
Exodus 25:12 in English
Exodus 25:12 · Berean Standard Bible
Cast four gold rings for it and fasten them to its four feet, two rings on one side and two on the other.
Context
10“Ha ga-eji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya ga-abụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya bụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ. 11Machie ọlaedo a nụchara anụcha nʼime na azụ ya niile, jiri ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile. 12Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnye ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya 13Jirikwa osisi akashia mee mkpara ogologo. Emesịa, were ọlaedo machie mkpara ndị a. 14Ị ga-etinye mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ, ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.