Ọpụpụ 23:9
Exodus 23:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Abụkwala onye na-emegbu ndị ọbịa, nʼihi na ị maara ihe banyere ọnọdụ ndị ọbịa nke ọma. Gị onwe gị bụrịị ọbịa nʼIjipt.
Exodus 23:9 in English
Exodus 23:9 · Berean Standard Bible
Do not oppress a foreign resident, since you yourselves know how it feels to be foreigners; for you were foreigners in the land of Egypt.
Context
7Ebola mmadụ ibe gị ebubo ụgha. Esonyekwala gbuo onye aka ya dị ọcha, maọbụ onye na-eme ihe ziri ezi. Nʼihi na mụ onwe m agaghị ahapụ onye na-emebi iwu na-ataghị ya ahụhụ kwesiri ya. 8“Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka ndị na-ahụ ụzọ kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ. 9“Abụkwala onye na-emegbu ndị ọbịa, nʼihi na ị maara ihe banyere ọnọdụ ndị ọbịa nke ọma. Gị onwe gị bụrịị ọbịa nʼIjipt. 10“Afọ isi ka ị ga-agha mkpụrụ nʼala ubi gị, ghọọkwa ihe omume ya. 11Ma nʼafọ nke asaa, arụla ọrụ ọbụla nʼala ahụ ọzọ, hapụ ka ala ahụ zuru ike. Mgbe ahụ ndị ogbenye nʼetiti unu ga-aga nʼebe ahụ weta ihe oriri. Mkpụrụ ndị ọzọ fọdụrụ ga-adịrị ụmụ anụ ọhịa dị iche iche. Iwu ndị a ga-adịrị ubi vaịnị na ubi oliv unu niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.