Native Bible

Exodus 23:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ebola mmadụ ibe gị ebubo ụgha. Esonyekwala gbuo onye aka ya dị ọcha, maọbụ onye na-eme ihe ziri ezi. Nʼihi na mụ onwe m agaghị ahapụ onye na-emebi iwu na-ataghị ya ahụhụ kwesiri ya.

Exodus 23:7 in English

Exodus 23:7 · Berean Standard Bible

Stay far away from a false accusation. Do not kill the innocent or the just, for I will not acquit the guilty.

Context

5Ọ bụrụ na ị hụ onye kpọrọ gị asị ka ọ na-agbalị iwelite ịnyịnya ibu ya nke dara nʼihi ibu dị arọ o bu, elefula ya anya, kama gaa nyere ya aka bulite ịnyịnya ahụ. 6“Ewezugala ikpe ziri ezi nʼebe ndị ogbenye nọ, nʼihi ọnọdụ ogbenye ha. 7Ebola mmadụ ibe gị ebubo ụgha. Esonyekwala gbuo onye aka ya dị ọcha, maọbụ onye na-eme ihe ziri ezi. Nʼihi na mụ onwe m agaghị ahapụ onye na-emebi iwu na-ataghị ya ahụhụ kwesiri ya. 8“Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka ndị na-ahụ ụzọ kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ. 9“Abụkwala onye na-emegbu ndị ọbịa, nʼihi na ị maara ihe banyere ọnọdụ ndị ọbịa nke ọma. Gị onwe gị bụrịị ọbịa nʼIjipt.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.