Native Bible

Exodus 22:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, iwe m dị oke ọkụ ga-eripịa unu. Aga m ejikwa mma agha tigbuo unu. Ndị nwunye unu ga-aghọkwa ndị inyom na-enweghị di, ụmụ unu ga-abụkwa ndị na-enweghị nna.

Exodus 22:24 in English

Exodus 22:24 · Berean Standard Bible

My anger will be kindled, and I will kill you with the sword; then your wives will become widows and your children will be fatherless.

Context

22“Unu emegbula nwanyị ọbụla di ya nwụrụ, maọbụ onye ọbụla na-enweghị nne na nna. 23Unu megbuo ha, mee ka ha tikuo m, aga m anụ mkpu akwa ha, nyere ha aka. 24Mgbe ahụ, iwe m dị oke ọkụ ga-eripịa unu. Aga m ejikwa mma agha tigbuo unu. Ndị nwunye unu ga-aghọkwa ndị inyom na-enweghị di, ụmụ unu ga-abụkwa ndị na-enweghị nna. 25“Ọ bụrụ na ị gbazinyere onye Hibru ego, onye bụ nwa mgbei, ị gaghị anara ya ọmụrụnwa. 26Ọ bụrụ na ị nara ya uwe ya nʼihi ego ahụ ị gbazinyere ya, ekwela ka uwe ahụ nọgide nʼaka gị ruo mgbe anwụ dara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.