Native Bible

Exodus 22:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu megbuo ha, mee ka ha tikuo m, aga m anụ mkpu akwa ha, nyere ha aka.

Exodus 22:23 in English

Exodus 22:23 · Berean Standard Bible

If you do mistreat them, and they cry out to Me in distress, I will surely hear their cry.

Context

21“Ọ kwesighị ka mmadụ ọbụla mesie onye ọbịa ihe ike nʼụzọ ọbụla. Unu aghaghị icheta na unu bụ ndị ọbịa nʼala Ijipt. 22“Unu emegbula nwanyị ọbụla di ya nwụrụ, maọbụ onye ọbụla na-enweghị nne na nna. 23Unu megbuo ha, mee ka ha tikuo m, aga m anụ mkpu akwa ha, nyere ha aka. 24Mgbe ahụ, iwe m dị oke ọkụ ga-eripịa unu. Aga m ejikwa mma agha tigbuo unu. Ndị nwunye unu ga-aghọkwa ndị inyom na-enweghị di, ụmụ unu ga-abụkwa ndị na-enweghị nna. 25“Ọ bụrụ na ị gbazinyere onye Hibru ego, onye bụ nwa mgbei, ị gaghị anara ya ọmụrụnwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.