Native Bible

Exodus 22:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“E kwesighị ịhapụ nwanyị mgbaasị ndụ.

Exodus 22:18 in English

Exodus 22:18 · Berean Standard Bible

You must not allow a sorceress to live.

Context

16“Ọ bụrụ na nwoke arafuo nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,* site nʼime ka ha abụọ dinaa, nwoke ahụ ga-akwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ. Ọ ga-alụkwa ya dịka nwunye ya. 17Ọ bụrụ na nna nwaagbọghọ ahụ ekwenyeghị ka nwoke ahụ lụọ ya, nwoke ahụ aghaghị ịkwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ. 18“E kwesighị ịhapụ nwanyị mgbaasị ndụ. 19“Onye ọbụla ya na anụ ọbụla dinakọrọ, e kwesiri ime ka ọ nwụọ. 20“Onye ọbụla chụrụ aja nye chi ọzọ ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị, a ga-eme ka ọ nwụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.