Native Bible

Exodus 22:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ọ bụrụ na nwoke arafuo nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,* site nʼime ka ha abụọ dinaa, nwoke ahụ ga-akwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ. Ọ ga-alụkwa ya dịka nwunye ya.

Exodus 22:16 in English

Exodus 22:16 · Berean Standard Bible

If a man seduces a virgin who is not pledged in marriage and sleeps with her, he must pay the full dowry for her to be his wife.

Context

14“Ọ bụrụ na mmadụ agbaziri anụ ụlọ site nʼaka onye agbataobi ya, ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ anwụọ, maọbụ merụọ ahụ mgbe onyenwe ya na-anọghị nʼebe ahụ, onye ahụ a gbazinyere anụ ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ya. 15Ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ nọ na nke onyenwe ya, onye gbaziri ya agaghị akwụ ụgwọ ọbụla. Ọ bụrụ na a kwụrụ ego mgbazi ọbụla nʼisi anụmanụ a, onye gbaziri ya agaghị akwụghachi ego ọbụla, nʼihi na ego mgbazi ọ kwuru ka a ga-ewere dịka ụgwọ. 16“Ọ bụrụ na nwoke arafuo nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,* site nʼime ka ha abụọ dinaa, nwoke ahụ ga-akwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ. Ọ ga-alụkwa ya dịka nwunye ya. 17Ọ bụrụ na nna nwaagbọghọ ahụ ekwenyeghị ka nwoke ahụ lụọ ya, nwoke ahụ aghaghị ịkwụ ụgwọ isi nwaagbọghọ ahụ. 18“E kwesighị ịhapụ nwanyị mgbaasị ndụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.