Native Bible

Exodus 19:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị mmadụ niile a jikwa otu olu zaghachi ya sị, “Ihe ọbụla Onyenwe anyị kwuru ka anyị ga-eme.” Mosis gwara Onyenwe anyị ihe niile ndị Izrel kwuru.

Exodus 19:8 in English

Exodus 19:8 · Berean Standard Bible

And all the people answered together, “We will do everything that the LORD has spoken.” So Moses brought their words back to the LORD.

Context

6ma unu ga-abụrụ m alaeze ndị nchụaja, na mba dị nsọ.’ Okwu ndị a ka ị ga-agwa ụmụ Izrel.” 7Mosis gara kpọkọta ndị okenye ndị Izrel, gwa ha okwu niile nke Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. 8Ndị mmadụ niile a jikwa otu olu zaghachi ya sị, “Ihe ọbụla Onyenwe anyị kwuru ka anyị ga-eme.” Mosis gwara Onyenwe anyị ihe niile ndị Izrel kwuru. 9Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Lee, agaje m izute gị nʼime igwe ojii gbara ọchịchịrị. Achọrọ m ka ụmụ Izrel niile were ntị ha nụrụ mgbe m ga-agwa gị okwu, ọzọkwa, ka ha kwerekwa na gị ruo mgbe niile.” Mosis gwara ndị Izrel niile okwu nke Onyenwe anyị gwara ya. 10Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ọzọ sị, “Rịdakwuru ndị m, doo ha nsọ taa na echi. Nʼihi na nke a ga-abụ nkwado ha izute m. Ka ha saa uwe ha mmiri,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.