Ọpụpụ 19:7
Exodus 19:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mosis gara kpọkọta ndị okenye ndị Izrel, gwa ha okwu niile nke Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
Exodus 19:7 in English
Exodus 19:7 · Berean Standard Bible
So Moses went back and summoned the elders of the people and set before them all these words that the LORD had commanded him.
Context
5Nʼihi nke a, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi nke ọma ma debe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụ ihe onwunwe nke m dị oke ọnụahịa. Nʼezie, ụwa niile bụ nke m, 6ma unu ga-abụrụ m alaeze ndị nchụaja, na mba dị nsọ.’ Okwu ndị a ka ị ga-agwa ụmụ Izrel.” 7Mosis gara kpọkọta ndị okenye ndị Izrel, gwa ha okwu niile nke Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. 8Ndị mmadụ niile a jikwa otu olu zaghachi ya sị, “Ihe ọbụla Onyenwe anyị kwuru ka anyị ga-eme.” Mosis gwara Onyenwe anyị ihe niile ndị Izrel kwuru. 9Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Lee, agaje m izute gị nʼime igwe ojii gbara ọchịchịrị. Achọrọ m ka ụmụ Izrel niile were ntị ha nụrụ mgbe m ga-agwa gị okwu, ọzọkwa, ka ha kwerekwa na gị ruo mgbe niile.” Mosis gwara ndị Izrel niile okwu nke Onyenwe anyị gwara ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.