Native Bible

Exodus 18:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Jetro, nna nwunye Mosis, nụrụ ihe ndị a niile, ọ sịrị Mosis, “Ihe ị na-eme adịghị mma.

Exodus 18:17 in English

Exodus 18:17 · Berean Standard Bible

But Moses’ father-in-law said to him, “What you are doing is not good.

Context

15Mosis zara nna nwunye ya sị, “Nʼihi na ha bịara ịjụta m ihe si nʼaka Chineke. 16Ọ bụrụ na esemokwu adịrị nʼetiti mmadụ ọbụla na ibe ya, ha na-abịakwute m, ka m kpebie ihe dị nʼetiti mmadụ na ibe ya. Ana m eme ka ha mata iwu na ụkpụrụ Chineke.” 17Mgbe Jetro, nna nwunye Mosis, nụrụ ihe ndị a niile, ọ sịrị Mosis, “Ihe ị na-eme adịghị mma. 18Ike ga-agwụ gị, gwụkwa igwe mmadụ ndị a. Ọrụ a ị na-arụ dị ukwuu karịa gị. Naanị gị agaghị ebuli ya. 19Ugbu a, gee m ntị. M ga-adụ gị ọdụ, ka Chineke nọnyekwara gị. Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na ị bụ onye na-anọchi anya ndị a nʼihu Chineke. Nʼụzọ dị otu a, i nwere ike iweta nsogbu niile ha nwere nʼihu Chineke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.