Ọpụpụ 18:14
Exodus 18:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọgọ Mosis hụrụ ihe niile ọ na-emere ndị mmadụ, nke a mere na ọ jụrụ, “Gịnị bụ ihe nke a ị na-emere ndị a? Gịnị mere i ji nọdụ ala naanị gị, ndị a niile gbaa gị gburugburu malite nʼụtụtụ ruo nʼanyasị?”
Exodus 18:14 in English
Exodus 18:14 · Berean Standard Bible
When his father-in-law saw all that Moses was doing for the people, he asked, “What is this that you are doing for the people? Why do you sit alone as judge, with all the people standing around you from morning till evening?”
Context
12Jetro, nna nwunye Mosis chụọrọ Chineke aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ. Emesịa, Erọn na ndị okenye Izrel bịara soro Mosis na ọgọ ya nwoke rie ihe nʼihu Chineke. 13Nʼụbọchị nke ọzọ ya, Mosis bịara nọdụ ala ikpere ndị mmadụ ikpe. Igwe mmadụ nọgidere Mosis site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. 14Ọgọ Mosis hụrụ ihe niile ọ na-emere ndị mmadụ, nke a mere na ọ jụrụ, “Gịnị bụ ihe nke a ị na-emere ndị a? Gịnị mere i ji nọdụ ala naanị gị, ndị a niile gbaa gị gburugburu malite nʼụtụtụ ruo nʼanyasị?” 15Mosis zara nna nwunye ya sị, “Nʼihi na ha bịara ịjụta m ihe si nʼaka Chineke. 16Ọ bụrụ na esemokwu adịrị nʼetiti mmadụ ọbụla na ibe ya, ha na-abịakwute m, ka m kpebie ihe dị nʼetiti mmadụ na ibe ya. Ana m eme ka ha mata iwu na ụkpụrụ Chineke.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.