Ọpụpụ 18:12
Exodus 18:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jetro, nna nwunye Mosis chụọrọ Chineke aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ. Emesịa, Erọn na ndị okenye Izrel bịara soro Mosis na ọgọ ya nwoke rie ihe nʼihu Chineke.
Exodus 18:12 in English
Exodus 18:12 · Berean Standard Bible
Then Moses’ father-in-law Jethro brought a burnt offering and sacrifices to God, and Aaron came with all the elders of Israel to eat bread with Moses’ father-in-law in the presence of God.
Context
10Jetro kwuru sị, “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị bụ. Onye napụtara unu site nʼaka ndị Ijipt na site nʼaka Fero. 11Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị kachasị chi ndị ọzọ niile elu, nʼihi na ọ zọpụtara ndị ya site nʼaka ndị Ijipt ndị sitere na mpako ha meso Izrel mmeso.” 12Jetro, nna nwunye Mosis chụọrọ Chineke aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ. Emesịa, Erọn na ndị okenye Izrel bịara soro Mosis na ọgọ ya nwoke rie ihe nʼihu Chineke. 13Nʼụbọchị nke ọzọ ya, Mosis bịara nọdụ ala ikpere ndị mmadụ ikpe. Igwe mmadụ nọgidere Mosis site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. 14Ọgọ Mosis hụrụ ihe niile ọ na-emere ndị mmadụ, nke a mere na ọ jụrụ, “Gịnị bụ ihe nke a ị na-emere ndị a? Gịnị mere i ji nọdụ ala naanị gị, ndị a niile gbaa gị gburugburu malite nʼụtụtụ ruo nʼanyasị?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.