Ọpụpụ 15:9
Exodus 15:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye iro nyara isi sị, ‘Aga m achụso ha, gafee ha. Aga m ekesa ihe a kwatara nʼagha. Nyejuo onwe m afọ site na ha. Aga m amịpụta mma agha m. Jiri aka m laa ha nʼiyi.’
Exodus 15:9 in English
Exodus 15:9 · Berean Standard Bible
The enemy declared, ‘I will pursue, I will overtake. I will divide the spoils; I will gorge myself on them. I will draw my sword; my hand will destroy them.’
Context
7“Nʼoke ike nke ịdị elu gị,
Ị lụgbuola ndị niile na-ebili imegide gị.
I zipụrụ iwe gị dị ọkụ,
o repịara ha dịka igbugbo ọka. 8I sitere na nkuume nke oghere imi gị,
mee ka mmiri osimiri guzoro ọtọ.
Mmiri ahụ na-erugharị erugharị guzoro nʼotu ebe dịka mgbidi;
ogbu mmiri kpụkọtara rahụ nʼala ala nsọtụ nke osimiri. 9Onye iro nyara isi sị,
‘Aga m achụso ha, gafee ha.
Aga m ekesa ihe a kwatara nʼagha.
Nyejuo onwe m afọ site na ha.
Aga m amịpụta mma agha m.
Jiri aka m laa ha nʼiyi.’ 10Ma i kupụrụ ikuku si gị nʼimi pụta,
osimiri riri ha,
ha mikpuru nʼime osimiri ukwu ahụ
dịka igwe. 11Onye dịka gị Onyenwe anyị,
nʼetiti chi niile?
Onye dịka gị?
Onye dị ebube nʼịdị nsọ.*
Onye otuto ya na-eyi egwu.
Onye na-arụ ọrụ dị ebube?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.