Ọpụpụ 15:5
Exodus 15:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ogbu osimiri ahụ ekpuchiela ha. Nʼime mmiri ahụ dị omimi ka ha rịdaruru dịka nkume.
Exodus 15:5 in English
Exodus 15:5 · Berean Standard Bible
The depths have covered them; they sank there like a stone.
Context
3Onye na-ebu agha ka Onyenwe anyị bụ.
Nʼezie, aha ya bụ Onyenwe anyị. 4Ụgbọ agha Fero na usuu ndị agha ya,
ka ọ tụnyere nʼosimiri ahụ.
Ndịisi agha Fero, ndị ahọrọ ahọ,
ka o mere ka Osimiri Uhie rie. 5Ogbu osimiri ahụ ekpuchiela ha.
Nʼime mmiri ahụ dị omimi ka ha rịdaruru dịka nkume. 6Aka nri gị Onyenwe anyị, dị ike,
dịkwa ebube.
Aka nri gị, Onyenwe anyị
na-etipịasị ndị iro. 7“Nʼoke ike nke ịdị elu gị,
Ị lụgbuola ndị niile na-ebili imegide gị.
I zipụrụ iwe gị dị ọkụ,
o repịara ha dịka igbugbo ọka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.