Ọpụpụ 13:10
Exodus 13:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ga na-eme mmemme a nʼoge a kara aka nʼafọ ọbụla.
Exodus 13:10 in English
Exodus 13:10 · Berean Standard Bible
Therefore you shall keep this statute at the appointed time year after year.
Context
8Nʼoge ọbụla ị na-eme mmemme a, kọwaara nwa gị nwoke ihe kpatara i ji eme mmemme a, si ya, ‘Ana m eme mmemme a maka icheta ihe Onyenwe anyị meere m, mgbe m si nʼIjipt pụta.’ 9Imezu mmemme a ga-adịrị unu dịka ihe ịrịbama nʼala unu, dịrịkwa ka ihe ngosi nʼegedege ihu unu, ichetara unu na Onyenwe anyị ji aka ike ya dupụta anyị site nʼala Ijipt. 10Unu ga na-eme mmemme a nʼoge a kara aka nʼafọ ọbụla. 11“Mgbe Onyenwe anyị dubatara unu nʼala ndị Kenan, nyefee unu ala ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha, 12unu ga-enyefe Onyenwe anyị ụmụ ndị ikom unu niile e bụ ụzọ mụọ. Ọzọ, ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ bụ nke Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.