Native Bible

Exodus 12:49 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu iwu a dịrị nwa afọ ala na ndị ọbịa niile bi nʼala Izrel.”

Exodus 12:49 in English

Exodus 12:49 · Berean Standard Bible

The same law shall apply to both the native and the foreigner who resides among you.”

Context

47Nzukọ niile nke ụmụ Izrel ga-eme Mmemme Ngabiga a. 48“Onye mba ọzọ bi nʼetiti unu chọrọ isoro unu na Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị aghaghị ibi ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ ya ugwu. Mgbe ahụ, ọ ga-abịaru nso isoro na mmemme, nʼihi na a ga-agụ ya dịka nwa afọ ala. Ọ dịghị onye ikom a na-ebighị ugwu ga-eri nri ahụ. 49Otu iwu a dịrị nwa afọ ala na ndị ọbịa niile bi nʼala Izrel.” 50Ụmụ Izrel mere ihe ndị a niile, dịka Onyenwe anyị nyere ha nʼiwu site nʼọnụ Mosis na Erọn. 51Ọ bụkwa nʼotu ụbọchị ahụ ka Onyenwe anyị sitere nʼala Ijipt dupụta ụmụ Izrel, dịka usuu ha niile si dị. 12:11 Akpụkpọụkwụ na belịt abụghị ihe ndị mmadụ na-eyi mgbe ọbụla ha nọ nʼụlọ. Mgbe ụmụ Izrel yiri ha, ha na-ezipụta okwukwe na olileanya ha nwere banyere ọpụpụ ha site nʼala Ijipt. 12:15 Ọ bụ nri a ha riri nʼabalị ụbọchị ahụ mere e ji akpọ ncheta Mmemme Ngabiga, Mmemme achịcha na-ekoghị eko. 12:25 Ofufe nʼebe ana-ekwu banyere mmemme ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.