Native Bible

Exodus 10:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Biko gbagharakwa m mmehie nke a, ma rịọọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu ka o wepụrụ m ọnwụ nke a. Ekwere m nkwa na agaghị m ajụkwa ọzọ ka unu laa.”

Exodus 10:17 in English

Exodus 10:17 · Berean Standard Bible

Now please forgive my sin once more and appeal to the LORD your God, that He may remove this death from me.”

Context

15Ha kpuchiri ala niile ruo mgbe ọchịchịrị gbachiri ya. Ha richapụrụ ihe niile na-eto nʼubi, na mkpụrụ niile na-amị nʼosisi, bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ukwu ahụ hapụrụ. Nʼikpeazụ, ọ dịghị ahịhịa ndụ fọdụrụ nʼala ma nʼelu osisi nʼIjipt niile. 16Na-atụfughị oge, Fero ziri ozi ka a kpọọ Mosis na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Emehiela m megide unu na Onyenwe anyị bụ Chineke unu. 17Biko gbagharakwa m mmehie nke a, ma rịọọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu ka o wepụrụ m ọnwụ nke a. Ekwere m nkwa na agaghị m ajụkwa ọzọ ka unu laa.” 18Mosis hapụrụ Fero pụọ gaa kpeere Onyenwe anyị ekpere. 19Ngwangwa, Onyenwe anyị zitere ikuku nke si nʼebe anyanwụ na-ada bịa, nke bupụrụ igurube ndị ahụ site nʼala Ijipt, buba ha nʼOsimiri Uhie. Ọ dịkwaghị otu igurube fọdụrụ nʼala Ijipt niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.