Ọpụpụ 10:18
Exodus 10:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mosis hapụrụ Fero pụọ gaa kpeere Onyenwe anyị ekpere.
Exodus 10:18 in English
Exodus 10:18 · Berean Standard Bible
So Moses left Pharaoh’s presence and appealed to the LORD.
Context
16Na-atụfughị oge, Fero ziri ozi ka a kpọọ Mosis na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Emehiela m megide unu na Onyenwe anyị bụ Chineke unu. 17Biko gbagharakwa m mmehie nke a, ma rịọọ Onyenwe anyị bụ Chineke unu ka o wepụrụ m ọnwụ nke a. Ekwere m nkwa na agaghị m ajụkwa ọzọ ka unu laa.” 18Mosis hapụrụ Fero pụọ gaa kpeere Onyenwe anyị ekpere. 19Ngwangwa, Onyenwe anyị zitere ikuku nke si nʼebe anyanwụ na-ada bịa, nke bupụrụ igurube ndị ahụ site nʼala Ijipt, buba ha nʼOsimiri Uhie. Ọ dịkwaghị otu igurube fọdụrụ nʼala Ijipt niile. 20Ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike, o kweghị ka ụmụ Izrel gaa fee Chineke ofufe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.