Esta 9:19
Esther 9:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ nke a mere ndị Juu niile bi nʼime ime obodo ji eme mmemme ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ nʼabalị iri na anọ nke ọnwa iri na abụọ nke afọ ọbụla. Ha mere ụbọchị ahụ ka ọ bụrụkwa ụbọchị inyerịta onyinye.
Esther 9:19 in English
Esther 9:19 · Berean Standard Bible
This is why the rural Jews, who live in the villages, observe the fourteenth day of the month of Adar as a day of joy and feasting. It is a holiday for sending gifts to one another.
Context
17E mere ihe ndị a nʼabalị iri na atọ nke ọnwa Ada,* ha zukwara ike nʼụbọchị so ya bụ abalị iri na anọ. Ha mere ụbọchị ahụ, ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ. 18Ma ndị Juu nọ na Susa zukọtara nʼụbọchị nke iri na atọ, na nʼụbọchị nke iri na anọ. Emesịa, nʼụbọchị nke iri na ise ha zuru ike, mekwa ya ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ. 19Ọ bụ nke a mere ndị Juu niile bi nʼime ime obodo ji eme mmemme ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ nʼabalị iri na anọ nke ọnwa iri na abụọ nke afọ ọbụla. Ha mere ụbọchị ahụ ka ọ bụrụkwa ụbọchị inyerịta onyinye. 20Emesịa, Mọdekai dere ihe ndị a niile nʼakwụkwọ, zigakwara ndị Juu niile nọ nʼokpuru ọchịchị eze Sekses, ma ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya, 21ka ha na-eme mmemme a kwa afọ nʼụbọchị nke iri na anọ na nke iri na ise nke ọnwa Ada ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.