Esta 9:18
Esther 9:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ndị Juu nọ na Susa zukọtara nʼụbọchị nke iri na atọ, na nʼụbọchị nke iri na anọ. Emesịa, nʼụbọchị nke iri na ise ha zuru ike, mekwa ya ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ.
Esther 9:18 in English
Esther 9:18 · Berean Standard Bible
The Jews in Susa, however, had assembled on the thirteenth and the fourteenth days of the month. So they rested on the fifteenth day, making it a day of feasting and joy.
Context
16Ma ndị Juu ndị ọzọ bi nʼobodo ndị ọzọ dị iche iche eze na-achị, jikọtakwara onwe ha ọnụ ịzọ ndụ ha, site otu a nwere onwe ha pụọ nʼaka ndị iro ha. Ha gburu iri puku mmadụ asaa na ise bụ ndị kpọrọ ha asị, ma ha emetụghị akụnụba ha aka. 17E mere ihe ndị a nʼabalị iri na atọ nke ọnwa Ada,* ha zukwara ike nʼụbọchị so ya bụ abalị iri na anọ. Ha mere ụbọchị ahụ, ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ. 18Ma ndị Juu nọ na Susa zukọtara nʼụbọchị nke iri na atọ, na nʼụbọchị nke iri na anọ. Emesịa, nʼụbọchị nke iri na ise ha zuru ike, mekwa ya ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ. 19Ọ bụ nke a mere ndị Juu niile bi nʼime ime obodo ji eme mmemme ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ nʼabalị iri na anọ nke ọnwa iri na abụọ nke afọ ọbụla. Ha mere ụbọchị ahụ ka ọ bụrụkwa ụbọchị inyerịta onyinye. 20Emesịa, Mọdekai dere ihe ndị a niile nʼakwụkwọ, zigakwara ndị Juu niile nọ nʼokpuru ọchịchị eze Sekses, ma ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.