Esta 4:9
Esther 4:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Hatak lọghachiri zie Esta ihe niile Mọdekai kwuru.
Esther 4:9 in English
Esther 4:9 · Berean Standard Bible
So Hathach went back and relayed Mordecai’s response to Esther.
Context
7Mọdekai kọọrọ ya ihe niile, na otu Heman si kwee nkwa ịkwụnye ego nʼụlọakụ eze ka e were laa ndị Juu nʼiyi. 8O nyekwara ya akwụkwọ iwu eze ebe e dere maka ịla ha nʼiyi, bụ nke akpọsara na Susa, ka o gosi ya Esta, kọwaakwa ya nye ya. Ọ gwara ya ka o nye ya iwu ka ọ bakwuru eze rịọ ya arịrịọ amara, rịọkwa ya ebere nʼihi ndị ya. 9Hatak lọghachiri zie Esta ihe niile Mọdekai kwuru. 10Ma Esta gwara Hatak ka o jeghachi gwa Mọdekai sị, 11“Ụwa niile maara nke ọma na onye ọbụla, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị, banyere nʼime ime ụlọeze mgbe eze na-akpọghị ya, ga-anwụ, karịakwa ma eze o setịpụrụ mkpara ọlaedo ya gosi onye ahụ na ọ nabatara ọbịbịa ya. Ugbu a, o meela ihe dị ka otu ọnwa kemgbe eze na-ezibeghị ozi ka a kpọọ m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.