Native Bible

Esther 4:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mọdekai kọọrọ ya ihe niile, na otu Heman si kwee nkwa ịkwụnye ego nʼụlọakụ eze ka e were laa ndị Juu nʼiyi.

Esther 4:7 in English

Esther 4:7 · Berean Standard Bible

and Mordecai told him all that had happened to him, including the exact amount of money that Haman had promised to pay into the royal treasury in order to destroy the Jews.

Context

5Mgbe ahụ, Esta ziri ka a kpọọ Hatak, otu nʼime ndị onozi eze, onye nke ọ bụ ọrụ ya ijere Esta ozi, gwa ya ka o jekwuru Mọdekai jụọ ya ihe kpatara nke a, na ihe mere o ji na-eme otu a. 6Hatak jere nʼama obodo ahụ ebe ọ hụrụ Mọdekai nʼọnụ ụzọ ụlọeze. 7Mọdekai kọọrọ ya ihe niile, na otu Heman si kwee nkwa ịkwụnye ego nʼụlọakụ eze ka e were laa ndị Juu nʼiyi. 8O nyekwara ya akwụkwọ iwu eze ebe e dere maka ịla ha nʼiyi, bụ nke akpọsara na Susa, ka o gosi ya Esta, kọwaakwa ya nye ya. Ọ gwara ya ka o nye ya iwu ka ọ bakwuru eze rịọ ya arịrịọ amara, rịọkwa ya ebere nʼihi ndị ya. 9Hatak lọghachiri zie Esta ihe niile Mọdekai kwuru.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.