Native Bible

Esther 3:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼọnwa mbụ, nke bụ ọnwa Nisan, nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị eze Ahasuerọs. Ha fere nza (nke bụ Pua) nʼihu Heman iji họpụta ụbọchị na ọnwa. Ma nza ahụ danyere nʼụbọchị nke iri na atọ nʼọnwa nke iri na abụọ, nke bụ ọnwa Aada.

Esther 3:7 in English

Esther 3:7 · Berean Standard Bible

In the twelfth year of King Xerxes, in the first month, the month of Nisan,* the Pur (that is, the lot) was cast before Haman to determine a day and month. And the lot fell on the twelfth month, the month of Adar.*

Context

5Ihe a were Heman iwe nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na Mọdekai jụrụ igbu ikpere nʼihu ya, maọbụ ịsọpụrụ ya. 6Mgbe ọ matara ndị Mọdekai ha bụ, ọ dị ya ka ihe ileda anya ma o gbuo naanị Mọdekai. Kama Heman chọrọ ụzọ ọ ga-esi laa ndị Mọdekai niile, bụ ndị Juu nọ nʼalaeze niile nke Sekses nʼiyi. 7Nʼọnwa mbụ, nke bụ ọnwa Nisan, nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị eze Ahasuerọs. Ha fere nza (nke bụ Pua) nʼihu Heman iji họpụta ụbọchị na ọnwa. Ma nza ahụ danyere nʼụbọchị nke iri na atọ nʼọnwa nke iri na abụọ, nke bụ ọnwa Aada. 8Mgbe ahụ Heman sịrị eze Sekses, “O nwere otu ndị gbasara ebe niile, nʼetiti ndị bi nʼobodo dị iche iche niile nke alaeze gị, ha kepụrụ onwe ha iche. Iwu ha dị iche site nʼiwu nke ndị mba ọzọ. Ha adịghị edebekwa iwu eze, ọ gaghị abara eze uru i hapụ ha ka ha nọdụrụ onwe ha. 9Ọ bụrụ na ọ masịrị eze, ya nye iwu ka a laa ha nʼiyi, aga m akwụnye puku talenti ọlaọcha iri nʼaka ndị nlekọta nʼihi ụlọakụ eze.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.