Native Bible

Esther 3:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọ matara ndị Mọdekai ha bụ, ọ dị ya ka ihe ileda anya ma o gbuo naanị Mọdekai. Kama Heman chọrọ ụzọ ọ ga-esi laa ndị Mọdekai niile, bụ ndị Juu nọ nʼalaeze niile nke Sekses nʼiyi.

Esther 3:6 in English

Esther 3:6 · Berean Standard Bible

And when he learned the identity of Mordecai’s people, he scorned the notion of * laying hands on Mordecai alone. Instead, he sought to destroy all of Mordecai’s people, the Jews, throughout the kingdom of Xerxes.

Context

4Ha na-agwa ya okwu kwa ụbọchị kwa ụbọchị, ma o geghị ha ntị. Nʼihi nke a, ha gwara Heman ihe banyere ya, ịhụ ma ọ ga-anabata omume Mọdekai, ebe ọ gwara ha na ya bụ onye Juu. 5Ihe a were Heman iwe nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na Mọdekai jụrụ igbu ikpere nʼihu ya, maọbụ ịsọpụrụ ya. 6Mgbe ọ matara ndị Mọdekai ha bụ, ọ dị ya ka ihe ileda anya ma o gbuo naanị Mọdekai. Kama Heman chọrọ ụzọ ọ ga-esi laa ndị Mọdekai niile, bụ ndị Juu nọ nʼalaeze niile nke Sekses nʼiyi. 7Nʼọnwa mbụ, nke bụ ọnwa Nisan, nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị eze Ahasuerọs. Ha fere nza (nke bụ Pua) nʼihu Heman iji họpụta ụbọchị na ọnwa. Ma nza ahụ danyere nʼụbọchị nke iri na atọ nʼọnwa nke iri na abụọ, nke bụ ọnwa Aada. 8Mgbe ahụ Heman sịrị eze Sekses, “O nwere otu ndị gbasara ebe niile, nʼetiti ndị bi nʼobodo dị iche iche niile nke alaeze gị, ha kepụrụ onwe ha iche. Iwu ha dị iche site nʼiwu nke ndị mba ọzọ. Ha adịghị edebekwa iwu eze, ọ gaghị abara eze uru i hapụ ha ka ha nọdụrụ onwe ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.