Esta 3:11
Esther 3:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eze gwara Heman, “Enyela m gị ọlaọcha ahụ, ya na ndị a. Mee ha dịka o si dị gị mma.”
Esther 3:11 in English
Esther 3:11 · Berean Standard Bible
“Keep your money,” said the king to Haman. “These people are given to you to do with them as you please.”
Context
9Ọ bụrụ na ọ masịrị eze, ya nye iwu ka a laa ha nʼiyi, aga m akwụnye puku talenti ọlaọcha iri nʼaka ndị nlekọta nʼihi ụlọakụ eze.” 10Ya mere, eze gbapụtara ọlaaka ikike ya* nye ya Heman nwa Hamedata onye Agag, onye iro ndị Juu 11Eze gwara Heman, “Enyela m gị ọlaọcha ahụ, ya na ndị a. Mee ha dịka o si dị gị mma.” 12Nʼabalị iri na atọ nke ọnwa mbụ, a kpọkọrọ ndị ode akwụkwọ eze niile. Ha depụtara nʼakwụkwọ isi obodo dị iche iche, nakwa nʼasụsụ ndị ọbụla, ihe niile Heman nyere nʼiwu nye ndị nnọchị anya eze niile, ndị ọchịchị nke ala niile ha na-achị, na ndịisi nke ndị ọbụla nọ nʼime alaeze a. E ji aha Ahasuerọs dee akwụkwọ ndị ahụ, werekwa mgbaaka eze nʼonwe ya kaa ya akara. 13E zipụrụ ndị ọgba ọsọ ozi eze ka ha gaa nʼisi obodo ọbụla nʼalaeze ahụ, na-enye iwu a edere nʼakwụkwọ ka a laa nʼiyi, gbuo, ma kpochapụkwa ndị Juu niile, ma nwantakịrị ma okenye, ma nwanyị, ma ụmụntakịrị, nʼotu ụbọchị, nʼabalị iri na atọ nke ọnwa iri na abụọ, nke bụ ọnwa Aada, nakwa ịpụnara ha akụnụba ha nʼike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.