Native Bible

Esther 3:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, eze gbapụtara ọlaaka ikike ya* nye ya Heman nwa Hamedata onye Agag, onye iro ndị Juu

Esther 3:10 in English

Esther 3:10 · Berean Standard Bible

So the king removed the signet ring from his finger and gave it to Haman son of Hammedatha, the Agagite, the enemy of the Jews.

Context

8Mgbe ahụ Heman sịrị eze Sekses, “O nwere otu ndị gbasara ebe niile, nʼetiti ndị bi nʼobodo dị iche iche niile nke alaeze gị, ha kepụrụ onwe ha iche. Iwu ha dị iche site nʼiwu nke ndị mba ọzọ. Ha adịghị edebekwa iwu eze, ọ gaghị abara eze uru i hapụ ha ka ha nọdụrụ onwe ha. 9Ọ bụrụ na ọ masịrị eze, ya nye iwu ka a laa ha nʼiyi, aga m akwụnye puku talenti ọlaọcha iri nʼaka ndị nlekọta nʼihi ụlọakụ eze.” 10Ya mere, eze gbapụtara ọlaaka ikike ya* nye ya Heman nwa Hamedata onye Agag, onye iro ndị Juu 11Eze gwara Heman, “Enyela m gị ọlaọcha ahụ, ya na ndị a. Mee ha dịka o si dị gị mma.” 12Nʼabalị iri na atọ nke ọnwa mbụ, a kpọkọrọ ndị ode akwụkwọ eze niile. Ha depụtara nʼakwụkwọ isi obodo dị iche iche, nakwa nʼasụsụ ndị ọbụla, ihe niile Heman nyere nʼiwu nye ndị nnọchị anya eze niile, ndị ọchịchị nke ala niile ha na-achị, na ndịisi nke ndị ọbụla nọ nʼime alaeze a. E ji aha Ahasuerọs dee akwụkwọ ndị ahụ, werekwa mgbaaka eze nʼonwe ya kaa ya akara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.